Native Bible

Judges 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ.

Judges 18:7 in English

Judges 18:7 · Berean Standard Bible

So the five men departed and came to Laish, where they saw that the people were living securely, like the Sidonians, tranquil and unsuspecting. There was nothing lacking in the land and no oppressive ruler. And they were far away from the Sidonians and had no alliance with anyone.

Context

5Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.” 6Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị Onyenwe anyị.” 7Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ. 8Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?” 9Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.