Native Bible

Judges 18:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”

Judges 18:23 in English

Judges 18:23 · Berean Standard Bible

When they called out after them, the Danites turned to face them and said to Micah, “What is the matter with you that you have called out such a company?”

Context

21Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha. 22Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha. 23Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?” 24Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ” 25Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.