Ndị Ikpe 18:10
Judges 18:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”
Judges 18:10 in English
Judges 18:10 · Berean Standard Bible
When you enter, you will come to an unsuspecting people and a spacious land, for God has delivered it into your hand. It is a place where nothing on earth is lacking.”
Context
8Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?” 9Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya. 10Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.” 11Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ. 12Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.