Ndị Ikpe 17:10
Judges 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.”
Judges 17:10 in English
Judges 17:10 · Berean Standard Bible
“Stay with me,” Micah said to him, “and be my father and priest, and I will give you ten shekels of silver * per year, a suit of clothes, and your provisions.” So the Levite went in
Context
8hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem. 9Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?”
Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.” 10Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.” 11Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom. 12Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.