Ndị Ikpe 16:8
Judges 16:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin.
Judges 16:8 in English
Judges 16:8 · Berean Standard Bible
So the lords of the Philistines brought her seven fresh bowstrings that had not been dried, and she tied him up with them.
Context
6Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.” 7Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.” 8Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin. 9Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa. 10Emesịa, Delaịla gwara Samsin sị ya, “Lee, ị kwaala m emo, ghaara m ụgha. Biko, gwa m ụzọ a ga-esi kee gị agbụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.