Ndị Ikpe 14:5
Judges 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu* nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin.
Judges 14:5 in English
Judges 14:5 · Berean Standard Bible
Then Samson went down to Timnah with his father and mother and came to the vineyards of Timnah. Suddenly a young lion came roaring at him,
Context
3Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?”
Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.” 4(Nne na nna ya aghọtaghị na aka Onyenwe anyị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.) 5Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu* nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin. 6Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere. 7Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.