Native Bible

Judges 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.

Judges 14:17 in English

Judges 14:17 · Berean Standard Bible

She wept the whole seven days of the feast, and finally on the seventh day, because she had pressed him so much, he told her the answer. And in turn she explained the riddle to her people.

Context

15Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?” 16Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?” 17Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara. 18Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.” 19Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn.* Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.