Ndị Ikpe 14:10
Judges 14:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.
Judges 14:10 in English
Judges 14:10 · Berean Standard Bible
Then his father went to visit the woman, and Samson prepared a feast there, as was customary for the bridegroom.
Context
8Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ. 9Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm. 10Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di. 11Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ. 12Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.