Ndị Ikpe 13:17
Judges 13:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
Judges 13:17 in English
Judges 13:17 · Berean Standard Bible
Then Manoah said to the angel of the LORD, “What is your name, so that we may honor you when your word comes to pass?”
Context
15Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.” 16Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị. 17Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?” 18Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m?* Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” 19Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.