Ndị Ikpe 11:34
Judges 11:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
Judges 11:34 in English
Judges 11:34 · Berean Standard Bible
And when Jephthah returned home to Mizpah, there was his daughter coming out to meet him with tambourines and dancing! She was his only child; he had no son or daughter besides her.
Context
32Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu. 33O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn. 34Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ. 35Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.” 36Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.