Native Bible

Judges 11:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta.

Judges 11:24 in English

Judges 11:24 · Berean Standard Bible

Do you not possess whatever your god Chemosh grants you? So also, we possess whatever the LORD our God has granted us.

Context

22Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan. 23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ? 24Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta. 25Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha? 26Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.