Native Bible

Judges 11:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya.

Judges 11:18 in English

Judges 11:18 · Berean Standard Bible

Then Israel traveled through the wilderness and bypassed the lands of Edom and Moab. They came to the east side of the land of Moab and camped on the other side of the Arnon. But they did not enter the territory of Moab, since the Arnon was its border.

Context

16Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh. 17Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh. 18“Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya. 19“Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’ 20Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.