Native Bible

Judges 10:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”

Judges 10:14 in English

Judges 10:14 · Berean Standard Bible

Go and cry out to the gods you have chosen. Let them save you in your time of trouble.”

Context

12ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha? 13Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ. 14Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!” 15Ma ndị Izrel sịrị Onyenwe anyị, “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọbụla i chere dị gị mma, ma biko, zọpụta anyị taa.” 16Ha sitere nʼetiti ha wezuga chi ala ọzọ niile dị iche iche, fee Onyenwe anyị ofufe. O nweghịkwa ike nagide ọnọdụ ọjọọ ndị Izrel gaa nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.