Native Bible

Judges 1:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.

Judges 1:26 in English

Judges 1:26 · Berean Standard Bible

And the man went to the land of the Hittites, built a city, and called it Luz, which is its name to this day.

Context

24ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.” 25Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ. 26Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa. 27Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ. 28Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.