Native Bible

Judges 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.

Judges 1:17 in English

Judges 1:17 · Berean Standard Bible

Then the men of Judah went with their brothers the Simeonites, attacked the Canaanites living in Zephath, and devoted the city to destruction.* So it was called Hormah.*

Context

15Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda. 16Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ* soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad. 17Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa. 18Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu. 19Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.