Aịzaya 8:9
Isaiah 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.
Isaiah 8:9 in English
Isaiah 8:9 · Berean Standard Bible
Huddle together,* O peoples, and be shattered; pay attention, all you distant lands; prepare for battle, and be shattered; prepare for battle, and be shattered!
Context
7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta
iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha,
bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile.
Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile,
ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile, 8wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile,
ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru.
Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị,
O Ịmanụel.” 9Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu.
Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya.
Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu.
Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu. 10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya.
Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo
nʼihi na Chineke nọnyere anyị.* 11Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.