Aịzaya 65:3
Isaiah 65:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,
Isaiah 65:3 in English
Isaiah 65:3 · Berean Standard Bible
to a people who continually provoke Me to My face, sacrificing in the gardens and burning incense on altars of brick,
Context
1“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.
Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.
Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,
asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’ 2Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ
nye ndị na-enupu isi,
bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi
ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha, 3ndị na-anọgide na-akpasu m iwe
nʼihu m mgbe niile,
ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,
nʼebe ịchụ aja eji brik wuo, 4ndị na-anọdụ nʼetiti ili,
ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;
ndị na-eri anụ ezi,
ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha; 5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,
nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’
Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.
Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.