Native Bible

Isaiah 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”

Isaiah 6:5 in English

Isaiah 6:5 · Berean Standard Bible

Then I said: “Woe is me, for I am ruined, because I am a man of unclean lips dwelling among a people of unclean lips; for my eyes have seen the King, the LORD of Hosts.”

Context

3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.” 4Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ. 5Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!” 6Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.* 7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.