Aịzaya 39:7
Isaiah 39:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
Isaiah 39:7 in English
Isaiah 39:7 · Berean Standard Bible
And some of your descendants, your own flesh and blood, will be taken away to be eunuchs in the palace of the king of Babylon.”
Context
5Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 6Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 7A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.” 8Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Udo na nchekwa ga-adị nʼoge ndụ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.