Native Bible

Isaiah 37:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,

Isaiah 37:18 in English

Isaiah 37:18 · Berean Standard Bible

Truly, O LORD, the kings of Assyria have laid waste all these countries and their lands.

Context

16“O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. 17Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ. 18“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu, 19ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. 20Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.