Aịzaya 36:1
Isaiah 36:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha.
Isaiah 36:1 in English
Isaiah 36:1 · Berean Standard Bible
In the fourteenth year of Hezekiah’s reign, Sennacherib king of Assyria attacked and captured all the fortified cities of Judah.
Context
1Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha. 2Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa. 3Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.