Native Bible

Isaiah 30:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”

Isaiah 30:22 in English

Isaiah 30:22 · Berean Standard Bible

So you will desecrate your silver-plated idols and your gold-plated images. You will throw them away like menstrual cloths, saying to them, “Be gone!”

Context

20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. 21Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.” 22Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!” 23Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara. 24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.