Aịzaya 13:22
Isaiah 13:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya. 13:6 Izk 30:3; Ems 5:18; Zef 1:7; Mkp 6:17 13:13 Heg 2:6 13:13 Abụ 110:5; Akw 1:12
Isaiah 13:22 in English
Isaiah 13:22 · Berean Standard Bible
Hyenas will howl in her fortresses and jackals * in her luxurious palaces. Babylon’s time is at hand, and her days will not be prolonged.
Context
20Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.
Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;
ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ. 21Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,
na ikwighịkwighị,
nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị. 22A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.
Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.
Lee na oge ha ji emezu adịla nso,
a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
13:6 Izk 30:3; Ems 5:18; Zef 1:7; Mkp 6:17
13:13 Heg 2:6
13:13 Abụ 110:5; Akw 1:12
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.