Native Bible

Isaiah 10:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.

Isaiah 10:28 in English

Isaiah 10:28 · Berean Standard Bible

Assyria has entered Aiath and passed through Migron, storing their supplies at Michmash.

Context

26Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt. 27Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu. 28Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash. 29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ. 30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.