Aịzaya 1:26
Isaiah 1:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
Isaiah 1:26 in English
Isaiah 1:26 · Berean Standard Bible
I will restore your judges as at first, and your counselors as at the beginning. After that you will be called the City of Righteousness, the Faithful City.”
Context
24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị,
“Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m,
ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ. 25Aka m ga-abịakwasị unu.
Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo,
si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu. 26Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ.
Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu
Obodo Ezi Omume,
Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.” 27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn.
Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya. 28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi;
ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.