Native Bible

Hosea 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.

Hosea 7:16 in English

Hosea 7:16 · Berean Standard Bible

They turn, but not to the Most High; they are like a faulty bow. Their leaders will fall by the sword for the cursing of their tongue; for this they will be ridiculed in the land of Egypt.

Context

14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ. 15Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m. 16Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.