Native Bible

Hosea 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”

Hosea 1:2 in English

Hosea 1:2 · Berean Standard Bible

When the LORD first spoke through Hosea, He told him, “Go, take a prostitute as your wife and have children of adultery, because this land is flagrantly prostituting itself by departing from the LORD.”

Context

1Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel. 2Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.” 3Ya mere, ọ gara lụọ Goma nwa Diblaim, onye tụụrụ ime mụọra ya nwa nwoke. 4Onyenwe anyị gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.