Native Bible

Hebrews 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.

Hebrews 9:7 in English

Hebrews 9:7 · Berean Standard Bible

But only the high priest entered the second room, and then only once a year, and never without blood, which he offered for himself and for the sins the people had committed in ignorance.

Context

5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a. 6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama. 8Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo. 9Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.