Ndị Hibru 8:12
Hebrews 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”*
Hebrews 8:12 in English
Hebrews 8:12 · Berean Standard Bible
For I will forgive their iniquities and will remember their sins no more.”*
Context
10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,
mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,
dekwasị ya nʼobi ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”* 13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.
8:5 Ọpụ 25:40
8:12 Jer 31:31-34
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.