Native Bible

Hebrews 6:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.

Hebrews 6:17 in English

Hebrews 6:17 · Berean Standard Bible

So when God wanted to make the unchanging nature of His purpose very clear to the heirs of the promise, He guaranteed it with an oath.

Context

15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa. 16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ. 17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe. 18Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. 19Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.