Ndị Hibru 4:2
Hebrews 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
Hebrews 4:2 in English
Hebrews 4:2 · Berean Standard Bible
For we also received the good news just as they did; but the message they heard was of no value to them, since they did not share the faith of those who comprehended it.*
Context
1Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya. 2Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya. 3Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo,
“Aṅụrụ m iyi nʼiwe m,
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”*
O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa. 4Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.