Ndị Hibru 3:1
Hebrews 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
Hebrews 3:1 in English
Hebrews 3:1 · Berean Standard Bible
Therefore, holy brothers, who share in the heavenly calling, set your focus on Jesus, the apostle and high priest whom we confess.
Context
1Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.