Ndị Hibru 12:5
Hebrews 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
Hebrews 12:5 in English
Hebrews 12:5 · Berean Standard Bible
And you have forgotten the exhortation that addresses you as sons: “My son, do not take lightly the discipline of the Lord, and do not lose heart when He rebukes you.
Context
3Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba. 4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. 5Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,
“Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ
maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. 6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.
Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”* 7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.