Native Bible

Hebrews 12:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ.

Hebrews 12:22 in English

Hebrews 12:22 · Berean Standard Bible

Instead, you have come to Mount Zion, to the city of the living God, the heavenly Jerusalem. You have come to myriads of angels

Context

20Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”* 21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”* 22Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ. 23Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke. 24Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.