Ndị Hibru 11:14
Hebrews 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha.
Hebrews 11:14 in English
Hebrews 11:14 · Berean Standard Bible
Now those who say such things show that they are seeking a country of their own.
Context
12Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri. 13Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa. 14Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha. 15Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. 16Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.