Native Bible

Hebrews 10:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.

Hebrews 10:27 in English

Hebrews 10:27 · Berean Standard Bible

but only a fearful expectation of judgment and of raging fire that will consume all adversaries.

Context

25Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso. 26Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile. 27Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro. 28Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya. 29Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.