Hegai 2:9
Haggai 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
Haggai 2:9 in English
Haggai 2:9 · Berean Standard Bible
The latter glory of this house will be greater than the former, says the LORD of Hosts. And in this place I will provide peace, declares the LORD of Hosts.”
Context
7Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 8‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 9‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.” 10Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai. 11“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.