Native Bible

Haggai 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.”

Haggai 1:6 in English

Haggai 1:6 · Berean Standard Bible

You have planted much but harvested little. You eat but never have enough. You drink but never have your fill. You put on clothes but never get warm. You earn wages to put into a bag pierced through.”

Context

4“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?” 5Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya. 6Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.” 7Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu. 8Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.