Native Bible

Haggai 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’ ”

Haggai 1:2 in English

Haggai 1:2 · Berean Standard Bible

that this is what the LORD of Hosts says: “These people say, ‘The time has not yet come to rebuild the house of the LORD.’”

Context

1Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’ ” 3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị, 4“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.