Native Bible

Genesis 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”

Genesis 9:17 in English

Genesis 9:17 · Berean Standard Bible

So God said to Noah, “This is the sign of the covenant that I have established between Me and every creature on the earth.”

Context

15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ. 16Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.” 17Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.” 18Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.) 19Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.