Jenesis 7:13
Genesis 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
Genesis 7:13 in English
Genesis 7:13 · Berean Standard Bible
On that very day Noah entered the ark, along with his sons Shem, Ham, and Japheth, and his wife, and the three wives of his sons—
Context
11Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa. 12Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. 13Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya. 14Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku. 15Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.