Native Bible

Genesis 50:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt.

Genesis 50:7 in English

Genesis 50:7 · Berean Standard Bible

Then Joseph went to bury his father, and all the servants of Pharaoh accompanied him—the elders of Pharaoh’s household and all the elders of the land of Egypt—

Context

5‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’ ” 6Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.” 7Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt. 8Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen. 9Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.