Jenesis 47:25
Genesis 47:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.”
Genesis 47:25 in English
Genesis 47:25 · Berean Standard Bible
“You have saved our lives,” they said. “We have found favor in our lord’s eyes, and we will be Pharaoh’s servants.”
Context
23Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero. 24Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.” 25Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.” 26Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a. 27Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.