Native Bible

Genesis 47:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.

Genesis 47:22 in English

Genesis 47:22 · Berean Standard Bible

However, he did not acquire the priests’ portion of the land, for it had been given to them by Pharaoh. They ate the rations that Pharaoh supplied; so they did not sell their land.

Context

20Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero. 21Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya. 22Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha. 23Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero. 24Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.