Jenesis 45:6
Genesis 45:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi.
Genesis 45:6 in English
Genesis 45:6 · Berean Standard Bible
For the famine has covered the land these two years, and there will be five more years without plowing or harvesting.
Context
4Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. 5Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. 6Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. 7Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. 8“Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.