Native Bible

Genesis 44:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’

Genesis 44:32 in English

Genesis 44:32 · Berean Standard Bible

Indeed, your servant guaranteed the boy’s safety to my father, saying, ‘If I do not return him to you, I will bear the guilt before you, my father, all my life.’

Context

30“Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a, 31mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ. 32Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’ 33“Ya mere ugbu a, biko, ka ohu gị nọdụ dịka ohu onyenwe m nʼọnọdụ nwantakịrị a, ka nwantakịrị a soro ụmụnne ya laghachikwuru nna anyị. 34Aga m esi aṅaa laghachikwuru nna m ma ọ bụrụ na mụ na nwantakịrị a esoghị? Enweghị m ike ilekwasị ihe ọjọọ ga-adakwasị nna m anya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.