Jenesis 44:3
Genesis 44:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha.
Genesis 44:3 in English
Genesis 44:3 · Berean Standard Bible
At daybreak, the men were sent on their way with their donkeys.
Context
1Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya. 2Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya. 3Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha. 4Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma? 5Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.