Jenesis 44:26
Genesis 44:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’
Genesis 44:26 in English
Genesis 44:26 · Berean Standard Bible
But we answered, ‘We cannot go down there unless our younger brother goes with us. So if our younger brother is not with us, we cannot see the man.’
Context
24Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru. 25“Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’ 26anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’ 27“Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ. 28Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.