Native Bible

Genesis 44:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.

Genesis 44:13 in English

Genesis 44:13 · Berean Standard Bible

Then they all tore their clothes, loaded their donkeys, and returned to the city.

Context

11Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya. 12Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ. 13Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta. 14Mgbe Juda na ụmụnne ya lọghachiri nʼụlọ Josef, ha hụrụ Josef ka ọ nọ nʼebe ahụ. Ha dara nʼala nʼihu ya. 15Ma Josef jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe a unu mere? Ọ bụ na unu amataghị na onye dịka m nwere ike ịmata onye zuru iko m?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.