Jenesis 43:32
Genesis 43:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ.
Genesis 43:32 in English
Genesis 43:32 · Berean Standard Bible
They separately served Joseph, his brothers, and the Egyptians. They ate separately because the Egyptians would not eat with the Hebrews, since that was detestable to them.
Context
30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa. 31Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ. 32Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ. 33Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya. 34O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.